Isaiah 30

Ahụhụ dịrị mba na-eme isiike

1“Ahụhụ ga-adịrị ụmụ ndị nnupu isi,”
Nke a bụ nʼihi mmekọrịta ha na ndị Ijipt 2Ez 18:21.

otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“bụ ndị na-agbaso nzube nke na-esiteghị nʼaka m,
ndị ha na ndị ọzọ na-agba ndụ nke Mmụọ m na-anabataghị,
si otu a na-eme ka mmehie na-aba ụba nʼelu mmehie.
2Ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka
ma ha ajụtaghị ase site nʼaka m.
Ndị were obi ha tụkwasị na Fero maka nchebe,
chọsiekwa ike ime Ijipt ebe mgbaba.
3Ma nchekwa Fero ga-aghọrọ unu ihe ihere,
ndo ndị Ijipt ga-etinye unu nʼọnọdụ mweda nʼala.
4Ọ bụ ezie na ha nwere ndị ozi na Zoan
ndị nnọchi anya ha erutekwala Hans,
5ihere ga-eme onye ọbụla
nʼihi ndị na-abaghị uru nye ha,
ndị na-abụghị ihe inyeaka maọbụ ihe iba uru,
kama naanị ihe ihere na ịta ụta.”
6Amụma banyere ụmụ anụmanụ bi na Negev.

Nʼala ahụhụ na mkpagbu,
nke ọdụm na nne ọdụm,
nke ajụala na agwọ ọjọọ na-efe ka ọkụ,
ndị nnọchite anya obodo na-ebu akụ ha niile nʼelu ịnyịnya ibu,
na-ebukwa akụnụba ha dị oke ọnụahịa nʼelu ịnyịnya kamel,
na-agakwuru mba ahụ na-abaghị uru,
7bụ Ijipt, ndị inyeaka ha na-enye enweghị isi.
Nʼihi nke a, ana m agụ ya
Rehab, onye na-enweghị ihe ọ na-arụ.

8Gaa ugbu a, dekwasịrị ha ya nʼelu mbadamba nkume,
detuokwa ha nʼime akwụkwọ,
ka ọ dịrị maka ụbọchị na-abịa
dịka ihe akaebe ruo mgbe ebighị ebi.
9Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enupu isi, ụmụ aghụghọ
ndị kpachaara anya jụ ịnabata ozizi Onyenwe anyị na-ezi.
10Ha na-agwa ndị ọhụ ụzọ,
“Unu ahụkwala ọhụ, o zuola,”
ma sịkwa ndị amụma,
“Mechienụ ọnụ! Unu ahụtakwarala anyị ihe ziri ezi nʼọhụ unu.
Gwanụ anyị ihe na-atọ ụtọ na ntị,
buonu amụma nduhie.
11Unu na-anọchiri anyị ụzọ,
nyenụ anyị ohere.
Anyị achọkwaghị ịnụ ihe ọbụla
banyere onye ahụ unu na-akpọ Onye dị nsọ nke Izrel.”
12Ya mere, ihe a ka Onye dị nsọ nke Izrel na-ekwu,

“Nʼihi na unu kpọrọ okwu m na-agwa unu asị,
ma dabere na mmegbu
na-atụkwasịkwa obi unu nʼaghụghọ,
13mmehie a ga-aghọrọ unu
ihe dịka mgbidi dị elu, nke gbawara agbawa,
nke ga-ada na mberede, nʼotu ntabi anya.
14Ọ ga-etipịasị dịka ite aja,
nke etipịara na-enweghị obi ebere,
nke a na-enweghị ike ịchọta mpekele ejuju ọbụla nʼetiti ya,
iji gụta ọkụ site na-ekwu,
maọbụ kupụta mmiri site nʼite.”
15Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nsọ nke Izrel sịrị,

“Ọ bụ na nchegharị na izuike ka a ga-azọpụta unu,
na ịnọ juu na ntụkwasị obi ka ịdị ike unu ga-adị,
ma unu ekweghị na nke ọbụla.
16Kama unu na-asị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼelu ịnyịnya gbapụ.’
E, unu ga-agba ọsọ nʼezie.
Unu sịrị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼịnyịnya ndị na-efe ọsọ.’
Ya mere, ndị ga-achụ unu ga-adị ngwa.
17Otu onye nʼime ndị iro unu
ga-achụ puku mmadụ nʼime unu ọsọ.
Mmadụ ise si nʼime ha
ezuola ịchusasị unu,
ruo mgbe unu ga-adị
ka osisi a manyere ọkọlọtọ debe nʼelu ugwu,
e, ka ọkọlọtọ a hapụrụ nʼelu ugwu nta.”

18Ma Onyenwe anyị nọkwa na-echere ka unu bịakwute ya,
ka o gosi unu ịhụnanya ya.
O jikeere imere unu ebere, nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi.
Ngọzị na-adịkwara ndị niile na-ele anya inyeaka ya.
19Unu ndị Zayọn ndị bi na Jerusalem, ndị nke m, unu agaghị ebekwa akwa ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye obi ebere. Ọ ga-enyere unu aka mgbe ọbụla unu kpọkuru ya. 20Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị na-enye unu achịcha nke nhụju anya na mmiri nke ahụhụ, ndị ozizi unu agaghị abụkwa ndị zoro onwe ha ọzọ, kama unu ga-eji anya unu hụ ha. 21Ma unu tụgharịrị nʼaka nri ma ọ bụkwanụ nʼaka ekpe, ntị unu ga-anụ otu olu nʼazụ unu, nke na-asị, “Nke a bụ ụzọ, Jeenụ ije nʼime ya.” 22Mgbe ahụ kwa, unu ga-emebi arụsị unu niile, nke e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ. Unu ga-atụfukwa ha dịka ihe ruru unyi, nke na-asọ oyi. Unu ga-asị ha, “Pụọnụ nʼebe a!”

23Ọ ga-ezitekwa mmiri ozuzo maka mkpụrụ unu kụrụ nʼala ubi unu, ihe omume nke ga-esite nʼala ahụ pụta ga-ama abụba baakwa ụba. Nʼụbọchị ahụ anụ ụlọ unu ga-ata nri nʼebe ịta nri sara mbara. 24Ehi na ịnyịnya ibu ndị na-arụ ọrụ ubi ga-ata nri a gwara nke ọma nke nnu dị, nke eji ngwa ọrụ ịfụcha ọka na shọvel kpasaa nke ọma. 25Nʼelu ugwu ọbụla dị elu na nʼelu ugwu nta ọbụla dị elu, ka iyi na mmiri niile ga-eru, nʼụbọchị oke ogbugbu, mgbe ụlọ elu niile ga-ada. 26Ọnwa ga-amụke dịka anwụ, ìhè anyanwụ ga-adịkwa okpukpu asaa dịka ìhè ụbọchị asaa e mere ka ọ mụọ nʼotu ụbọchị! Ihe ndị a ga-emezu nʼụbọchị ahụ Onyenwe anyị malitere ikechi na ịgwọ ọnya o mere ka o rute ndị ya aka.

27Lee, Aha Onyenwe anyị ka o si nʼebe dị anya na-abịa!
Ọ na-abịa nʼoke iwe, anwụrụ ọkụ gbakwara ya gburugburu.
Iwe jupụtara nʼegbugbere ọnụ ya,
okwu ya na-erechapụ dịka ọkụ.
28Iku ume ya dịkwa ka iyi rubigara oke, nke na-achị ọkụ,
nke na-etoru onye nọ nʼime ya nʼolu.
Ọ na-ayọcha mba niile nʼime nyọ ịla nʼiyi,
ọ na-etinye nʼagba ndị mmadụ
eriri igwe nke na-edufu ha.
29Ma unu ga-abụ abụ
dịka unu na-abụ nʼabalị mmemme dị nsọ,
obi unu ga-aṅụrị ọṅụ
dịka mgbe ndị na-egbu opi na-arịgo elu
na-aga nʼugwu nsọ Onyenwe anyị,
na-agakwuru Oke Nkume Izrel.
30 Onyenwe anyị ga-eme ka ndị mmadụ nụ olu ya dị ebube,
ọ ga-emekwa ka ha hụ aka ya na-arịdata ala
jiri ọnụma nke iwe ya na ọkụ na-erepịa erepịa,
jirikwa oke mmiri ozuzo, na egbe eluigwe, na akụmmiri igwe.
31Olu Onyenwe anyị ga-emenye ndị Asịrịa egwu;
ọ ga-eji mkpara igwe ya kụdaa ha nʼala.
32Ihe otiti ọbụla nke Onyenwe anyị na-eji mkpọ ya,
tie ha nʼahụ
ga-adị ka egwu ụbọ akwara na une dị iche iche na-enye,
mgbe ọ na-eweli aka ya na-eti ha oke ihe otiti dịka ọ na-alụso ha ọgụ.
33Edoolarị ihe niile nʼusoro site nʼoge gara aga.
A kwadoola ebe a ga-akwanye ọkụ nke ga-erechapụ eze ahụ.
Ọ bụ ebe sara mbara, nke dị omimi,
na nke a kwajuru nkụ.
Ọ bụ iku ume Onyenwe anyị
nke dịka mwụpụta nke nkume na-enwu ọkụ
ka a ga-eji mụnye ya ọkụ.
Copyright information for IboBIU